Psalms 21

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid.

Ekele maka mmeri

1O Onyenwe anyị, lee na eze na-aṅụrị ọṅụ nʼike gị.
Obi na-atọkwa ya ụtọ nke ukwuu nʼihi mmeri niile i nyere ya!

2I nyela ya ihe obi ya chọrọ;
i mekwaara ya ihe niile ọ rịọrọ gị! Sela
3I ji ngọzị bara ụba nabata ya,
ọ bụkwa okpueze e ji ọlaedo a ṅụchara nke ọma kpụọ ka i kpukwasịrị ya nʼisi.
4Ọ rịọrọ ka i nye ya ndụ, i zara ekpere ya
mekwaa ka o nwee ogologo ndụ nke ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
5Nsọpụrụ ya dị ukwuu site na mmeri niile i nyere ya,
ebube na ịma mma bụ onyinye i nyere ya.
6Nʼezie, i nyela ya ngọzị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
i mere ka o nwee obi ụtọ nke na-esite nʼọṅụ nke nọnyere gị.
7Nʼihi na eze na-atụkwasị Onyenwe anyị obi,
agaghị ewezuga ya nʼọnọdụ ya site nʼịhụnanya
nke Onye kachasị ihe niile elu nke na-enweghị ọgwụgwụ.

8Ị ga-anwụchi ndị iro gị niile;
aka nri gị ga-ejidekwa ndị kpọrọ gị asị.
9Mgbe ị pụtara ịlụ ọgụ,
ị ga-erepịa ha dịka ọkụ nke na-enwu ajọ onwunwu.
Nʼoke iwe ya, Onyenwe anyị ga-elo ha,
ọkụ ya ga-erepịakwa ha.
10Ị ga-esite nʼelu ụwa laa agbụrụ ha niile nʼiyi,
ụmụ ha kwa site, nʼetiti ụmụ mmadụ.
11Nʼagbanyeghị na ha nwere ike ịpịa ọpịpịa ọjọọ megide gị,
maọbụ tụpụta atụmatụ ọjọọ, ha agaghị emezu ebumnuche ha.
12Nʼihi na i ga-eme ka ha gbaghachi azụ
mgbe i kwere ụta gị tụgide ha nʼihu.

13O Onyenwe anyị, ka e bulie gị elu nʼihi ike gị;
anyị ga-abụ abụ ma tokwaa ike gị.
Copyright information for IboBIU